1Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ ọhụrụ,98:1 Abụ 96:1
2Onyenwe anyị emeela ka a mata nzọpụta ya
3O chetala ịhụnanya ya
4Tikusienụ Onyenwe anyị mkpu ọṅụ ike, ụwa niile
5werenụ ụbọ akwara bụkuo Onyenwe anyị abụ,
6jirinụ opi na opi ike,
7Ka oke osimiri niile gbọọ ụja, ya na ihe niile dị nʼime ya,
8Ka osimiri na iyi niile kụọ aka ha,
9ka ha bụọ abụ nʼihu Onyenwe anyị,