1Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ ọhụrụ,
2Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ, toonu aha ya;
3Kwusaanụ ebube ya nʼetiti mba niile,
4Nʼihi na Onyenwe anyị dị ukwuu, bụrụkwa onye kwesiri ịnata otuto;
5Nʼihi na chi niile nke mba niile dị iche iche bụ arụsị efu,
6Ịma mma na ebube dị nʼihu ya;
7Nyenụ Onyenwe anyị, unu ezinaụlọ nke mba niile dị iche iche,
8Nyenụ Onyenwe anyị nsọpụrụ ruuru aha ya;
9Kpọọnụ isiala nye Onyenwe anyị nʼịma mma nke ịdị nsọ ya;
10Kwusaa nʼetiti mba niile sị, “Onyenwe anyị na-achị.”
11Ka mbara eluigwe ṅụrịa, ka ụwa nwekwa obi ụtọ;
12Ka ala ubi niile na ihe niile dị nʼime ha jupụta nʼobi ụtọ.
13Ka ihe niile e kere eke ṅụrịa ọṅụ nʼihu Onyenwe anyị, nʼihi na ọ na-abịa,