1Ọ bụ ihe ziri ezi ito Onyenwe anyị,
2ikwupụta ịhụnanya gị nʼụtụtụ,
3jiri ihe iti egwu ụbọ akwara
4Nʼihi na ị na-eme ka obi dị m ụtọ, site nʼọrụ gị niile, o Onyenwe anyị,
5Lee ka ọrụ gị si dị ukwuu, Onyenwe anyị.
6Ndị uche kọrọ amaghị nke a,
7ọ bụ ezie na ndị ajọ omume na-etopụta dịka ahịhịa
8Ma gị, O Onyenwe anyị, bụ onye e buliri elu ruo mgbe ebighị ebi.
9Nʼezie, ndị iro gị niile, Onyenwe anyị,
10I meela ka mpi m dị elu dịka oke ehi na-akpa ike;
11Ejirila m anya m abụọ hụ ka e meriri ndị iro m;
12Ma ndị ezi omume ga-awa igu dịka osisi nkwụ;
13nke a kụrụ nʼime ụlọ Onyenwe anyị,
14Ha ga-amị mkpụrụ, ọ bụladị mgbe ha mere agadi.
15na-ekwupụta, “Onyenwe anyị bụ Onye ziri ezi;