1Onye ahụ na-ebi nʼebe mgbaba Onye kachasị ihe niile elu
2Nke a ka m ga-ekwu maka Onyenwe anyị, “Ọ bụ ebe mgbaba m na ebe nchebe m e wusiri ike,
3Nʼezie, ọ ga-anapụta gị
4Ọ ga-eji nku ya kpuchie gị.
5Ị gaghị atụ egwu ihe ịtụ oke egwu nke abalị,
6maọbụ ajọ ọrịa na-efe efe, nke na-ejegharị nʼọchịchịrị,
7Puku mmadụ pụrụ ịda nʼakụkụ gị,
8Ọ bụ naanị anya gị abụọ ka ị ga-eji hụ
9Ọ bụrụ na i mee Onye kachasị ihe niile elu ebe obibi gị,
10mgbe ahụ, ihe ọjọọ ọbụla enweghị ike ịdakwasị gị;
11Nʼihi na ọ ga-enye ndị mmụọ ozi ya iwu banyere gị,
12Ha ga-eji ọbụ aka ha,
13Ị ga-azọkwasị ọdụm na ajụala ụkwụ,
14“Nʼihi na ọ hụrụ m nʼanya, Mụ onwe m ga-agbapụta ya, ka Onyenwe anyị kwuru;
15Ọ ga-akpọku m, aga m azakwa ya.
16Aga m eji ogologo ndụ mee ka afọ ju ya,