1O Onyenwe anyị, ebe obibi ka gị onwe gị bụrịị nye anyị
2Tupu e kee ugwu niile,90:2 Job 15:7; Ilu 8:25
3Ị na-eme ka mmadụ laghachi bụrụ aja
4Puku afọ dị nʼanya gị dịka otu ụbọchị;
5Nʼime ụra nke ọnwụ ka ị na-ekpochapụ mmadụ;
6ọ bụ ezie na ọ na-agbawa ụzarị na-etokwa eto nʼụtụtụ,
7E meela ka anyị gwụsịa nʼihi oke iwe gị megide anyị;
8Ị gbasaala njehie anyị niile nʼihu gị.
9Ogologo ụbọchị anyị niile na-agabiga nʼoke iwe gị;
10Ogologo ụbọchị anyị niile nwere ike ruo afọ iri asaa,
11Onye pụrụ ịghọta ịdị ike nke oke iwe gị?
12Kuziere anyị ịgụ ụbọchị niile nke ndụ anyị ọnụ,
13O Onyenwe anyị, nwee ntụgharị obi! Tutu ruo ole mgbe ka ọ ga-adị?
14Jiri ịhụnanya gị nke na-adịgide adịgide, mejupụta anyị nʼụtụtụ,
15Mee ka anyị nwee obi ụtọ, nke ọnụọgụgụ ụbọchị ya ga-adịkwa ka ọnụọgụgụ ụbọchị niile ị tara anyị ahụhụ,
16Kwere ka ndị ohu gị hụ ọrụ gị dị iche iche,
17Ka ihuọma Chineke, Onyenwe anyị dịkwasị anyị;