1O Onyenwe anyị, Chineke onye na-azọpụta m,
2Ka ekpere m bịa nʼihu gị.
3Nʼihi na ọtụtụ nsogbu ejupụtala mkpụrụobi m,
4Agụnyela m nʼetiti ndị na-arịda nʼolulu.
5A họpụtara mụ na ndị nwụrụ anwụ iche,
6Ị tụbanyela m nʼime olulu dịkarịrị omimi,
7Oke iwe gị na-anyịgide m nke ukwuu;
8Ị napụla m ndị enyi m, ndị m hụrụ nʼanya,
9anya m adịghị ahụkwa ụzọ nʼihi iru ụjụ.
10ọ bụ ndị nwụrụ anwụ ka ị na-egosi ọrụ ebube gị?
11Ọ bụ nʼime ili ka a na-ekwupụta ịhụnanya gị?
12A na-amata banyere ọrụ ebube gị nʼebe ọchịchịrị dị?
13Ma Onyenwe anyị m, ọ bụ gị ka m na-akpọku.
14O Onyenwe anyị, gịnị mere i jiri jụ m?
15Site na mgbe okorobịa m, abụ m onye a na-esogbu, onye nọkwa ọnwụ nso;
16Oke iwe gị agabigala nʼahụ m;
17Ha na-agba m gburugburu ụbọchị niile dịka idee mmiri;
18Ị napụla m ndị enyi m na ndị m hụrụ nʼanya;