1Gee m ntị, O Onyenwe anyị, ma zakwa m,
2Chebe ndụ m, nʼihi na m na-erubere gị isi;
3meere m ebere, O Onyenwe m,
4Wetara ohu gị ọṅụ, nʼihi na ọ bụ gị, O Onyenwe m,
5Ị bụ onye na-agbaghara ajọ omume na onye dị mma, O Onyenwe m,
6O Onyenwe anyị, nụrụ ekpere m;
7Nʼụbọchị nsogbu m, aga m akpọku gị,
8Nʼetiti chi niile, i nweghị oyiri, O Onyenwe m;
9Mba niile i kere ga-abịa nʼihu gị,
10Nʼihi na ị dị ukwuu na-arụkwa ọrụ ebube dị iche iche;
11Kuziere m ụzọ gị, O Onyenwe anyị,
12Aga m eji obi m niile too gị, O Onyenwe anyị, na Chineke m;
13Nʼihi na ịhụnanya gị nʼebe m nọ dị ukwuu;
14O Chineke, ndị mpako na-emegide m;
15Ma gị, Onyenwe anyị, ị bụ Chineke onye ọmịiko na onye amara,
16Chee m ihu, mekwaara m amara.
17Gosi m ihe ịrịbama nke ga-egosipụta ịdị mma gị,