1O! Chineke agbachikwala nkịtị.
2Lee na ndị iro gị nọ na-ebigbọ,
3Ha ji aghụghọ na-agba izu imegide ndị gị;
4Ha na-asị, “Bịanụ ka anyị laa mba a nʼiyi,
5Ha ji otu obi na-agbarịta izu;
6ụlọ ikwu niile nke ndị Edọm, na ndị Ishmel,
7na ndị Gebal, na ndị Amọn, na ndị Amalek,
8Ọ bụladị ndị Asịrịa esorokwala ha,
9Mee ha dịka i si mee ndị Midia,
10ndị lara nʼiyi nʼEndoa
11Mee ka ndị ọgaranya ha dịka Oreb na Zeeb,83:11 Ha bụ ndị eze, bụrụkwa ndị ọchịagha ndị Midia. Ha so na ndị Gidiọn meriri nʼagha, Nkp 7:25
12ndị sịrị, “Ka anyị nwetara onwe anyị,
13O Chineke m, mee ha ka dịka ahịhịa ifufe na-efegharị gburugburu,
14Dịka ọkụ na-erepịa oke ọhịa,
15si otu a were oke ifufe chụọ ha ọsọ,
16Were ihere kpuchie ha ihu,
17Ka ha nọdụ nʼọnọdụ ihere na ịda mba mgbe niile;
18Mee ka ha mata na gị, onye aha ya bụ Onyenwe anyị,