1Etikuru m Chineke nʼoke olu maka enyemaka;
2Mgbe m nọ nʼihe mgbu, ọ bụ Onyenwe anyị ka m chọrọ.
3O Chineke, echetara m gị, sụkwaa ude;
4I kweghị ka anya m abụọ mechie;
5Echere m echiche banyere ụbọchị niile gara aga,
6Echetara m abụ niile m na-abụ nʼime anyasị.
7“Onyenwe anyị ọ ga-agbakụta m azụ ruo mgbe ebighị ebi?
8Ọ pụtara na ịhụnanya ya nke na-adịgide ruo ebighị ebi agwụla?
9Chineke, o chefuola i mere anyị ebere?
10Mgbe ahụ, ekwuru m, “Lee ọnọdụ ọjọọ m,
11Aga m echeta ọrụ niile Onyenwe anyị rụrụ;
12Aga m atụgharịa uche m nʼọrụ gị niile,
13O Chineke, ụzọ gị niile dị nsọ.
14Ị bụ Chineke onye na-arụ ọrụ ebube dị iche iche;
15I ji aka gị dị ike gbapụta ndị gị,
16Osimiri hụrụ gị, O Chineke,
17Igwe ojii wụpụrụ mmiri,
18A nụrụ ụda egbe eluigwe gị nʼoke ifufe,
19Ọ bụ nʼosimiri ka nzọ ụkwụ gị gara,
20I sitere nʼaka Mosis na Erọn