We Believe JesusFé, Esperança e Nova Vida

Abụ Ọma 78

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · ib

← Abụ Ọma 77 Abụ Ọma Abụ Ọma 79 →

1Ndị m, nụrụnụ ihe m na-ezi;

2Aga m eji ilu malite okwu m,

3ihe ndị anyị nụrụla, marakwa,

4Anyị agaghị ezonarị ụmụ anyị ihe ndị a,

5O nyere Jekọb iwu banyere ụkpụrụ ya,

6ka ọgbọ na-eso ha nwee ike mụta ya,

7Mgbe ahụ, ha ga-atụkwasị Chineke obi ha,

8Ha agakwaghị adị ka ndị nna nna ha,

9Ndị ikom Ifrem, nʼagbanyeghị na ha kwere ụta ha,

10Ha edebeghị ọgbụgba ndụ Chineke.

11Ha chefuru ihe o mere,

12Chineke rụrụ ọrụ ebube ndị a nʼihu nna nna ha

13O kewara oke osimiri, site nʼetiti ya dufee ha.

14O ji igwe ojii duo ha nʼije nʼehihie,

15Ọ gbawara oke nkume dị nʼọzara,

16O mere ka mmiri iyi site na nkume gbapụta,

17Ha nọgidere na-emehie megide ya.

18Ha kpachara anya nwaa Chineke ọnwụnwa,

19Ha kwuhiere Chineke;

20Ọ bụ ezie na o tiri nkume ahụ ihe,

21Mgbe Onyenwe anyị nụrụ ihe ha kwuru, iwe were ya;

22Nʼihi na ha ekwenyeghị na Chineke,

23Nʼagbanyeghị ihe ndị a, o nyere mbara eluigwe iwu

24O mere ka mánà zokwasị ndị mmadụ a dịka mmiri, ka ha rie.

25Ndị mmadụ tara achịcha ndị mmụọ ozi.

26O sitere nʼeluigwe tọpụ ikuku nke ọwụwa anyanwụ,

27O zidatara ha anụ dị ukwuu dịka ọ bụ uzuzu,

28O mere ka ụmụ anụ ufe ndị a daara ha nʼala nʼetiti ọmụma ụlọ ikwu ha

29Ha riri ihe tutu ruo mgbe ha enwekwaghị ike iri ọzọ,

30Ha erisibeghị nri ahụ obi ha chọrọ,

31mgbe iwe Chineke biliri imegide ha;

32Ma na-eleghị ihe ndị a anya, ha gakwara nʼihu na mmehie ha,

33O mere ka ụbọchị ndụ ha bụrụ ihe efu.

34Mgbe ọbụla Chineke tigburu ha, ha na-achọ ya;

35Ha na-echeta na Chineke bụ Oke nkume ha,

36Ma mgbe ahụ, ha ga-eji naanị okwu efu fee ya ofufe,

37Obi ha ekwesịkwaghị ike nye ya.

38Ma o meere ha ebere.

39Nʼihi na o chetara na ha bụ naanị anụ ahụ nke o kere eke,

40Ọtụtụ oge ka ha nupuru isi megide ya nʼọzara;

41Mgbe mgbe, ha nwara Chineke;

42Ha echetaghị ike ya,

43nʼụbọchị o gosipụtara ihe ịrịbama niile nʼala Ijipt,

44O mere ka osimiri ha niile ghọọ ọbara.

45O zigakwara igwe ijiji nʼetiti ha, nke tara ha,

46O zitekwara ụmụ ụkpana ndị tachapụrụ mkpụrụ a kụrụ nʼubi ha,

47O ji oke mkpụrụ mmiri mebie osisi vaịnị ha,

48O weere ehi ha niile nyefee mkpụrụ mmiri,

49O zipụrụ iwe ọkụ ya nʼetiti ha,

50O doziri ụzọ nke iwe ya ga-eso;

51O tigburu nwa ọbụla e bụ ụzọ mụọ nʼala Ijipt,

52Ma o dupụtara ndị nke ya dịka igwe atụrụ;

53O duuru ha nʼudo, ụjọ atụkwaghị ha,

54Otu a ka o si duru ha bịaruo nʼoke ala nsọ ya,

55Ọ chụpụrụ mba niile nʼihu ha,

56Ma ha nwara Chineke ọnwụnwa,

57Dịka nna nna ha, ha bụ ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi, na ndị aghụghọ,

58Nʼihi ebe nchụaja ha wuru, ha mere ka iwe wee ya;

59Mgbe Chineke nụrụ ha, iwe were ya nke ukwuu.

60Ọ gbakụtara ụlọ nzute ya nke dị na Shaịlo78:60 Shaịlo dị nʼoke ala ebo Ifrem, nʼetiti Betel na Shekem. Ọ bụ ala nsọ ochie nʼoge Joshua, ebe ụmụ Izrel dọbara igbe ọgbụgba ndụ ahụ tutu ruo nʼoge Samuel. Ma ndị Filistia mesịrị bibie obodo a. azụ,

61O nyefere igbe ọgbụgba ndụ ike ya ka a dọta ya nʼagha,

62O kwere ka e gbuo ndị ya nʼagha;

63Ọkụ repịara ụmụ okorobịa ha,

64E gburu ndị nchụaja ha nʼagha;

65Mgbe ahụ, onyenwe anyị tetara dịka onye si nʼụra teta,

66Ọ chụghachiri ndị iro ya azụ,

67Ọ jụrụ ụlọ ikwu Josef,

68ma ọ họọrọ ebo Juda,

69O wuru ụlọnsọ ya ka ọ dị ka ebe dị elu,

70Ọ họpụtara Devid, ohu ya,

71o si nʼebe ọ nọ na-azụ atụrụ kpọrọ ya,

72Devid ji izuoke nke obi ya zụọ ha,

← Abụ Ọma 77 Abụ Ọma Abụ Ọma 79 →