1Nʼezie, Chineke dịịrị Izrel mma,
2Ma mụ onwe m, ọ fọdụrụ nwantịị ka m zọhie ụkwụ,
3Nʼihi na e kwosara m ndị mpako ekworo73:3 Abụ 37:1,7; Ilu 23:17;
4Ha anaghị adọgbu onwe ha;
5Nsogbu niile mmadụ ibe ha na-enwe adịghị erute ha.
6Nʼihi nke a, nganga bụ ihe ịnya nʼolu ha;
7Mmehie na-esite nʼobi ọjọọ ha apụta;
8Ha na-akwa emo, na-ejikwa iro ekwu okwu;
9Ha ji ọnụ ha na-ekwu na eluigwe bụ nke ha,
10Nʼihi nke a, ndị ha na-eso ha,
11Ha na-asị, “Olee otu Chineke ga-esi mara?
12Otu a ka ndị ajọ omume dị,
13Nʼezie, ọ bụ naanị nʼefu ka m debere obi m ọcha,
14Ogologo ụbọchị niile, anọ m na nsogbu;
15Ọ bụrụ na m kwuru sị, “Nke a ka m ga-ekwu,”
16Mgbe m gbalịrị ịghọta ihe ndị a niile,
17tutu ruo mgbe m bara nʼebe nsọ Chineke;
18Nʼezie, ị na-eguzo ha nʼala na-achị achị;
19Lee, ka ha si laa nʼiyi nʼotu ntabi anya,
20Dịka nrọ, mgbe mmadụ na-eteta,
21Mgbe m nọ nʼobi mwute;
22Abụ m onye nzuzu na onye na-amaghị ihe.
23Ma ana m anọnyere gị mgbe niile;
24Ị na-eji ndụmọdụ gị na-edu m,
25Onye ka m nwere nʼeluigwe ma ọ bụghị gị?
26Anụ ahụ m na mkpụrụobi m nwere ike ịda mba,
27Ndị niile nọpụrụ gị nʼebe dị anya ga-ala nʼiyi.
28Ma nye mụ onwe m, ọ dị mma ịnọ Chineke nso.