1O Chineke, jiri ikpe ziri ezi mejupụta eze.
2Ọ ga-eji ezi omume chịa ndị gị,
3Ka ugwu niile wetara ndị mmadụ ịba ụba;
4Ọ ga-ekpepụta ndị a na-emegbu nʼetiti ndị mmadụ,
5Ka ọ dịgide ruo mgbe niile dịka anyanwụ na-adịgide,
6Ọ ga-adị ka mmiri na-ezokwasị ala ubi a sụrụ asụ,
7Nʼoge ndụ ya, ka ndị ezi omume too, na-awasa;
8Ọ ga-achị site nʼosimiri ruo osimiri,
9Ebo niile ndị bi nʼọzara ga-akpọ isiala nye ya,
10Ndị eze Tashish72:10 Obodo Tashish dị nʼala Spen, ọ nọchiri anya nsọtụ nke ụwa, 2Ih 9:21 na mba niile dị nʼebe dị anya,
11Ndị eze niile ga-akpọ isiala nye ya,
12Nʼihi na ọ ga-azọpụta ndị nọ na mkpa mgbe ha kpọkuru ya.
13Ọ ga-enwe ọmịiko nʼahụ ndị na-enweghị ike, na ndị nọ na mkpa,
14Ọ ga-azọpụta ha site na mkpagbu na ihe ike,
15Ka ọ dị ogologo ndụ!
16Ka mkpụrụ ọka jupụta nʼebe niile nʼala a;
17Ka aha ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi;
18Otuto dịrị Onyenwe anyị Chineke, Chineke nke Izrel,
19Otuto dịrị aha ya dị ebube ruo ebighị ebi;
20Nke a bụ ọgwụgwụ ekpere Devid nwa Jesi.