1Chineke, gịnị mere i ji jụ anyị ruo mgbe ebighị ebi?
2Cheta mba ahụ nke ị zụtara na mgbe ochie,
3Tụgharịa nzọ ụkwụ gị bịa na mbibi ebighị ebi ndị a.
4Ndị iro gị gbọrọ ụja nʼebe i zutere anyị.
5Ha kpara agwa dịka ndị ikom ji anyụike
6Ha ji anyụike na egbugbu ha
7Ha kpọkwara ụlọnsọ gị ọkụ, mee ya ka o repịa.
8Ha sịrị nʼobi ha, “Anyị ga-etipịa ha kpamkpam!”
9Enyeghị anyị ihe ịrịbama ọbụla site nʼaka Chineke.
10O Chineke, ruo ole mgbe ka ndị iro ga-anọgide na-achị gị ọchị?
11Gịnị mere ị na-eseghachi aka gị azụ, e aka nri gị?
12Ma gị, O Chineke, bụrịị eze m site na mgbe ochie.
13Site nʼike gị dị ukwuu i mere ka osimiri kewaa abụọ.
14Ọ bụ gị gwepịara isi anụ ọjọọ ahụ a na-akpọ leviatan,
15Ọ bụ gị mere ka isi iyi na mmiri iyi na-asọ.
16Ehihie na abalị bụ nke gị.
17Ọ bụ gị kewapụtara oke ala niile nke ụwa.
18O Onyenwe anyị, cheta otu onye iro si chịa gị ọchị,
19Ewerala ndụ nduru gị nyefee anụ ọhịa ọjọọ nʼaka.
20Chetakwa ọgbụgba ndụ gị,
21Ekwela ka ndị a na-akpagbu gbaghachi azụ nʼihere;
22O Chineke, bilie, kpechitara onwe gị ikpe.
23Elepụla mkpọtụ nke ndị iro gị niile anya,