1Nụrụ olu m O Chineke, mgbe m na-akọsara gị ihe na-esogbu m.
2Zopu m pụọ nʼizu nzuzo niile nke ndị ọjọọ,
3Ha na-amụ ire ha dịka e si amụ mma agha,
4Ha na-agba onye na-enweghị ihe o mere àkụ site nʼebe nzuzo,
5Ha na-agbarịta ibe ha ume na-atụmatụ ọjọọ,
6Ha na-atụpụta atụmatụ ọjọọ na-asị,
7Ma Chineke ga-agba ha àkụ,
8Ọ ga-atụgharị okwu ọnụ ha megide ha,
9Mmadụ niile ga-atụ egwu,
10Ndị ezi omume ga-aṅụrị ọṅụ nʼime Onyenwe anyị,