1Nụrụ akwa m, O Chineke,
2Ana m akpọku gị site na nsọtụ nke ụwa,
3Nʼihi na ị bụrịị ebe mgbaba m,
4Ọ na-agụ m ibi nʼụlọ ikwu gị ruo mgbe ebighị ebi,
5Nʼihi na gị onwe gị, Chineke, anụla nkwa niile m kwere;
6Tụkwasị ọtụtụ ụbọchị na ndụ eze,
7Kwere ka ọ nọrọ nʼocheeze nʼihu Chineke ruo mgbe ebighị ebi;
8Mgbe ahụ, aga m abụ abụ otuto nye aha gị, ruo mgbe ebighị ebi.