We Believe JesusFé, Esperança e Nova Vida

Abụ Ọma 6

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · ib

← Abụ Ọma 5 Abụ Ọma Abụ Ọma 7 →

1O Onyenwe anyị, abarala m mba mgbe ị na-ewe iwe.

2Biko, meere m ebere Onyenwe anyị, nʼihi na adịghị m ike.

3Mkpụrụobi m nọ nʼọnọdụ ihe mgbu.

4Onyenwe anyị, biko, bịa zọpụta m;

5Nʼetiti ndị nwụrụ anwụ ọ dịghị onye na-ekwupụta aha gị.

6Ike agwụla m nʼihi ịsụ ude.

7Anya m adịghị ahụzikwa ụzọ nke ọma nʼihi ihe mwute;

8Sitenụ nʼebe m nọ wezuga onwe unu, unu ndị na-eme ajọ ihe,

9Onyenwe anyị anụla akwa m; ọ nụla arịrịọ nke m na-arịọ ya ka o meere m ebere.

10Ka ndị iro m niile bụrụ ndị ihere ga-eme.

← Abụ Ọma 5 Abụ Ọma Abụ Ọma 7 →