1O Onyenwe anyị, abarala m mba mgbe ị na-ewe iwe.
2Biko, meere m ebere Onyenwe anyị, nʼihi na adịghị m ike.
3Mkpụrụobi m nọ nʼọnọdụ ihe mgbu.
4Onyenwe anyị, biko, bịa zọpụta m;
5Nʼetiti ndị nwụrụ anwụ ọ dịghị onye na-ekwupụta aha gị.
6Ike agwụla m nʼihi ịsụ ude.
7Anya m adịghị ahụzikwa ụzọ nke ọma nʼihi ihe mwute;
8Sitenụ nʼebe m nọ wezuga onwe unu, unu ndị na-eme ajọ ihe,
9Onyenwe anyị anụla akwa m; ọ nụla arịrịọ nke m na-arịọ ya ka o meere m ebere.
10Ka ndị iro m niile bụrụ ndị ihere ga-eme.