1Onyenwe anyị, biko, nụrụ ekpere m
2Geekwa ntị nʼakwa arịrịọ m,
3Ụtụtụ ụbọchị niile, O Onyenwe anyị, ị ga-anụ olu m;
4Ị bụ Chineke, onye ihe ọjọọ ọbụla anaghị atọ ụtọ;
5Ndị mpako agaghị eguzo
6Ị ga-ala ndị niile na-agha ụgha nʼiyi;
7Ma mụ onwe m, aga m abata nʼime ụlọ gị,
8Onyenwe anyị, biko, duo m nʼime ezi omume gị
9Obi ha jupụtara nʼechiche ịla nʼiyi,
10Maa ha ikpe, Chineke.
11Ma mee ka onye ọbụla na-agbaba nʼime gị ṅụrịa;
12Nʼezie, O Onyenwe anyị, ị na-agọzi onye ezi omume.