1Kụọnụ aka unu, unu mba niile;
2Nʼihi na Onyenwe anyị bụ Chineke kachasị ihe niile elu.
3O wedara mba niile mee ka ha nọọ nʼokpuru anyị;
4Ọ họpụtaara anyị ihe nketa anyị,
5Chineke ewerela iti mkpu ọṅụ rigoro nʼeluigwe.
6Bụkuonụ Chineke abụ otuto, bụọ abụ otuto;
7Nʼihi na Chineke anyị bụ eze ụwa niile.
8Chineke bụ eze mba niile;
9Ndị niile a ma ama na mba niile ezukọtaala,