1Isi okwu dị ebube na-akpali mkpụrụobi m,
2I bụ onye kachasị mma nʼetiti ụmụ mmadụ,
3Kenye mma agha gị nʼukwu gị, gị onye dị ike;
4Nʼebube gị, gaa nʼihu nʼime mmeri,
5Ka àkụ gị niile dị nkọ mapuo mkpụrụobi ndị iro niile nke eze;
6O Chineke, ocheeze gị ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi,
7Ị hụrụ ezi omume nʼanya, ma kpọọ ihe ọjọọ asị;
8Uwe gị niile jupụtara nʼisisi ụtọ nke si na mmanụ45:8 Nke a bụ mmanụ isi ọma a na-efesa nʼuwe. Ọ nọ nʼọnọdụ ihe anyị na-akpọ senti taa. Abk 1:12-13. máá na aloos na akashia;
9Ụmụ agbọghọ eze nọ nʼetiti ndị inyom gị ka a na-asọpụrụ;
10Gee ntị, gị nwaagbọghọ, tulee ma nụrụkwa ihe m na-ekwu:
11Nʼihi na ịma mma gị ga-eme ka eze chọsie gị ike.
12Ada Taịa45:12 Eze mbụ kwụnyeere ọchịchị alaeze Devid bụ eze obodo Taịa, nʼihi Solomọn na eze Taịa nweere ezigbo mmekọrịta dị mma. Taịa bụ isi obodo ebe niile a na-azụ ahịa nʼakụkụ osimiri Mediterenịan. ga-eji onyinye bịa;
13Adaeze, lee ka o si maa mma dị ukwuu nʼime ụlọ ya;
14Ụmụ agbọghọ ibe ya, ndị na-amaghị nwoke, na-eso ya bịakwute gị;
15E ji ọṅụ na obi ụtọ dubata ha;
16Ụmụ gị ndị ikom ga-anọchi anya nna nna gị;
17Aga m eme ka echeta ihe banyere gị ruo ọgbọ niile;