1Biko, Onyenwe anyị, abarala m mba nʼiwe,
2Nʼihi na àkụ gị niile amapuola m ahụ,
3Nʼihi oke iwe gị, ọ dịghị izuoke dị nʼime anụ ahụ;
4Mmetụta ikpe ọmụma m na-adakwasị m
5Ọnya m na-ere ure na-asọ oyi
6Abụ m onye a nyidara ma kwatukwaa nʼala
7Azụ na-egbu m mgbu nke ukwuu
8Ume ọbụla adịghịkwa nʼime. Adị m ka onye e gwepịara egwepịa.
9O Onyenwe m, ị maara agụụ niile nke na-agụ obi m;
10Obi na-alọ m mmiri, ike na-agwụkwa m,
11Ndị m hụrụ nʼanya na ndị enyi m na-asọ m oyi nʼihi ọnya m,
12Ndị na-achọ igbu m na-esiri m ọnya,
13Adị m ka onye ntị chiri, onye na-apụghị ịnụ ihe ọbụla,
14Adịla m dịka onye na-anaghị anụ ihe,
15O Onyenwe anyị, ana m eche gị;
16Nʼihi na asịrị m, “Ekwela ka ha ṅụrịa ọṅụ nʼisi m;
17Nʼihi na lee, ana m achọ ịda ada.
18Ana m ekwupụta mmehie m;
19Ndị iro m, ndị na-eme ihe ike dị ọtụtụ,
20Ndị na-eji ihe ọjọọ akwụghachi m ezi ihe,
21O Onyenwe anyị, ahapụkwala m;
22Bịa ọsịịsọ inyere m aka