1Echegbula onwe gị nʼihi ndị na-eme ihe ọjọọ,
2nʼihi na mgbe na-adịghị anya, ha ga-akpọnwụ dịka ahịhịa,
3Tụkwasị Onyenwe anyị obi meekwa ihe ziri ezi;
4Ka ihe Onyenwe anyị tọọ gị ụtọ.
5Nyefee onwe gị nʼaka Onyenwe anyị;
6Ọ ga-eme ka ezi omume gị pụta ìhè dịka ihe nke chị ọbụbọ,
7Dere duu nʼihu Onyenwe anyị,
8Kwụsị iwe iwe, kwụsịkwa oke iwe;
9Nʼihi na a ga-ala ndị ajọ omume nʼiyi,
10Ọ fọdụrụ nwa oge nta, ndị ajọ omume ga-agabiga;
11Ma ndị niile dị nwayọọ nʼobi ga-eketa ala a dịka ihe nketa ha,
12Ndị ajọ omume na-agba izu ọjọọ megide ndị ezi omume,
13ma onyenwe anyị na-achị ndị ajọ omume ọchị,
14Ndị ajọ omume amịpụtala mma agha ha,
15Ma ha ga-ewere mma agha ha gbuo onwe ha,
16Ihe ntakịrị nke onye ezi omume nwere
17nʼihi na a ga-etiji ike niile nke ndị ajọ omume,
18Ndị na-enweghị ịta ụta na-ebi ndụ ha nʼokpuru nlekọta Onyenwe anyị,
19Nʼoge ihe ndakwasị, ha agaghị akpọnwụ;
20Ma ndị ajọ omume ga-ala nʼiyi.
21Ndị na-eme ihe ọjọọ na-ebiri mmadụ ihe ma ha adịghị akwụghachi ya,
22Ndị Onyenwe anyị gọziri agọzi ga-eketa akụ nke ụwa,
23Ọ bụrụ na Onyenwe anyị nwere mmasị na ndụ mmadụ,
24ọ bụrụ na ọ kpọbie ụkwụ, ọ gaghị ada,
25Abụ m nwantakịrị na mbụ, ugbu a, abụ m agadi,
26Mgbe niile, ha na-eme amara jiri obi ha na-agbazinye ndị mmadụ ihe,
27Site nʼihe ọjọọ pụọ, mee ezi ihe,
28Onyenwe anyị na-ahụ onye ezi omume na ikpe ziri ezi nʼanya.
29ndị ezi omume ga-eketa ala ahụ dịka ihe nketa ha,
30Okwu amamihe na-esi nʼọnụ onye ezi omume pụta,
31Iwu Chineke ya dị ya nʼobi;
32Ndị ajọ omume na-echere ndị ezi omume na nzuzo,
33ma Onyenwe anyị agaghị ahapụ ha nʼaka ha,
34Chere Onyenwe anyị,
35Ahụla m onye ajọ omume na nwoke na-eme ihe ike,
36ma ọ dịghị anya, ọ nwụrụ,
37Ma tụgharịa uche banyere ndị ezi omume, rịbaa ndị ụzọ ha ziri ezi ama;
38Ma a ga-ala ndị mmehie niile nʼiyi;
39Nzọpụta nke ndị ezi omume si nʼaka Onyenwe anyị bịa;
40Onyenwe anyị na-enyere ha aka, na-anapụtakwa ha