1Aga m eto Onyenwe anyị mgbe niile.
2Mkpụrụobi m ga-anya isi na Onyenwe anyị;
3Soro m too Onyenwe anyị;
4Nʼihi na etikuru m Onyenwe anyị mkpu akwa, ọ zakwara m,
5Ihu ndị na-elekwasị ya anya na-enwu dịka ihe;
6Onye ogbenye a kpọkuru Onyenwe anyị, ọ zakwara ya;
7Mmụọ ozi Onyenwe anyị na-agba ndị niile na-atụ egwu ya gburugburu
8Jiri aka gị tulee ma hụkwa na Onyenwe anyị dị mma;
9Tụọnụ egwu Onyenwe anyị, unu ndị nsọ ya,
10Agụụ nwere ike ịgụ ụmụ ọdụm, ike pụkwara ịgwụ ha,
11Ụmụ m, bịanụ gee m ntị;
12Onye ọbụla nʼime unu hụrụ ndụ nʼanya,
13chezie ire gị ka ọ ghara ikwu ihe ọjọọ,
14Site nʼihe ọjọọ wezuga onwe gị ma mee ezi ihe,
15Anya Onyenwe anyị dị nʼahụ ndị ezi omume,
16ma ihu Onyenwe anyị na-emegide ndị na-eme ihe ọjọọ,
17Onyenwe anyị na-anụ olu ndị ezi omume, mgbe ha na-akpọku ya ka o nyere ha aka;
18Onyenwe anyị na-anọ ndị niile obi ha tiwara etiwa nso,
19Nsogbu na-adakwasị ndị ezi omume na-adị ukwuu,
20Ọ na-anapụtakwa ha kpamkpam.
21Ihe ọjọọ ga-eme ka onye ajọ omume nwụọ;
22Onyenwe anyị na-agbapụta ndị ohu ya;