1Tienụ mkpu ọṅụ nye Onyenwe anyị, unu ndị ezi omume;
2Werenụ ụbọ akwara too Onyenwe anyị;
3Bụkuonụ ya abụ ọhụrụ;
4Nʼihi na okwu Onyenwe anyị niile ziri ezi bụrụkwa eziokwu;
5Onyenwe anyị na-ahụ ezi omume na ikpe ziri ezi nʼanya;
6Ọ bụ site nʼokwu ọnụ Onyenwe anyị ka e ji kee eluigwe niile,
7Ọ bụ ya kekwara osimiri niile chịkọta ha nʼotu ebe,
8Ka ụwa niile tụọ Onyenwe anyị egwu;
9Nʼihi na o kwuru okwu, okwu ahụ mezukwara;
10Onyenwe anyị na-emebi atụmatụ mba niile;
11Atụmatụ Onyenwe anyị na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi,
12Mba a gọziri agọzi ka mba ahụ bụ, bụ ndị Chineke bụ Onyenwe anyị ha;
13Onyenwe anyị si nʼeluigwe na-ele ndị mmadụ bi nʼụwa anya.
14O sitere nʼebe obibi ya na-ele
15Ebe ọ bụ ya kpụrụ obi mmadụ niile nʼotu na otu;
16Ọnụọgụgụ ndị agha eze apụghị ịzọpụta ya;
17Ịnyịnya agha ezukwaghị iwetara ndị na-agba ha mmeri nʼagha.
18Ma Onyenwe anyị ji anya ya na-eche ndị niile na-atụ ya egwu nche,
19Ọ ga-anapụta ha site nʼaka ọnwụ.
20Anyị ji olileanya eche Onyenwe anyị;
21Obi anyị na-aṅụrị ọṅụ nʼime ya;
22O Onyenwe anyị, ka ịhụnanya gị na-adịgidere anyị,