1Onyenwe anyị na-azụ m dịka atụrụ, ọ dịghị ihe akọrọ m.
2Ọ na-eme ka m dinaa ala nʼebe ahịhịa ndụ na-eto,
3ọ na-atụte mkpụrụobi m.
4A sịkwarị na m na-aga ije,
5Ị na-akwado tebul23:5 Nʼoge ochie, ọ bụ nʼebe iri nri (tebul) ka enyi na enyi na-anọ agba ndụ, maọbụ nwe nkwekọrịta. Oriri a na-egosi na ọgbụgba ndụ bụ ihe ọṅụ na ezi mmekọrịta nke enyi na enyi. Eze ahụ nke na-azụ ndị ya dịka atụrụ, nabatara ohu ya bụ Devid nʼebe iri nri, dịka e dere ya nʼabụ ọma a. nʼihu m,
6Nʼezie, ịdị mma na ebere ga-agbaso m