1O Onyenwe anyị, lee na eze na-aṅụrị ọṅụ nʼike gị.
2I nyela ya ihe obi ya chọrọ;
3I ji ngọzị bara ụba nabata ya,
4Ọ rịọrọ ka i nye ya ndụ, i zara ekpere ya
5Nsọpụrụ ya dị ukwuu site na mmeri niile i nyere ya,
6Nʼezie, i nyela ya ngọzị na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi,
7Nʼihi na eze na-atụkwasị Onyenwe anyị obi,
8Ị ga-anwụchi ndị iro gị niile;
9Mgbe ị pụtara ịlụ ọgụ,
10Ị ga-esite nʼelu ụwa laa agbụrụ ha niile nʼiyi,
11Nʼagbanyeghị na ha nwere ike ịpịa ọpịpịa ọjọọ megide gị,
12Nʼihi na i ga-eme ka ha gbaghachi azụ
13O Onyenwe anyị, ka e bulie gị elu nʼihi ike gị;