1O Onyenwe anyị, ahụrụ m gị nʼanya, gị bụ ike m.
2Onyenwe anyị bụ oke nkume m, na ebe mgbaba m e wusiri ike, na onye nnapụta m.
3Akpọkuru m Onyenwe anyị, onye e kwesiri inye otuto,
4Ụdọ niile nke ọnwụ kere m agbụ;
5Ụdọ nke ili kere m gburugburu,
6Nʼọnọdụ oke mkpagbu m, akpọkuru m Onyenwe anyị;
7Ụwa mere mkpọtụ, maa jijiji,
8Anwụrụ ọkụ sitere ya nʼimi pụta,
9O kewara mbara eluigwe, rịdata;
10Ọ nọkwasịrị nʼelu cherubim18:10 Cherubim bụ mmụọ ndị ahụ dị ike na ndị jupụtara nʼebube nke anya na-adịghị ahụ. Ọrụ ha bụ ibu ocheeze Ebube ahụ. Izk 1:26 felie elu,
11O mere ọchịchịrị ebe nzuzo ya, ihe mkpuchi nke gbara ya gburugburu,
12Site nʼìhè nke na-enwupụta nʼahụ ya, igwe ojii
13Onyenwe anyị sitere nʼeluigwe bigbọọ;
14Ọ gbara àkụ ya, mee ka ndị iro gbasasịa,
15E kpughere ala ala nke oke osimiri,
16O sitere nʼelu setịpụ aka ya,
17Ọ napụtara m site nʼaka ndị iro m dị ike,
18Ha guzogidere m nʼụbọchị ihe ndakwasị m,
19Ọ kpọpụtara m gaa nʼebe sara mbara,
20Onyenwe anyị mesoro m dịka ezi omume m si dị;
21Nʼihi na edebezuola m ụzọ niile nke Onyenwe anyị,
22Iwu ya niile dị nʼihu m,
23Abụ m onye na-enweghị ịta ụta nʼihu ya,
24Onyenwe anyị kwụghachiri m dịka ezi omume m si dị,
25Nʼebe onye kwesiri ntụkwasị obi nọ, i na-egosi onwe gị onye kwesiri ntụkwasị obi,
26Nʼebe onye dị ọcha nọ, ị na-egosi onwe gị onye dị ọcha,
27Ị na-azọpụta ndị dị umeala nʼobi,
28Ọ bụ gị, Onyenwe anyị, na-eme ka oriọna m na-enwu,
29Site nʼinyeaka gị, apụrụ m ịlụso igwe ndị agha ọgụ,
30Ma banyere Chineke, ụzọ ya zuruoke,
31Nʼihi na onye bụ Chineke, ma ọ bụghị naanị Onyenwe anyị?
32Ọ bụ Chineke na-enye m ike,
33Ọ na-eme ka ụkwụ m dị gara gara, dịka nke nne ele;
34Ọ na-azụ aka m abụọ ibu agha,
35Ị na-eme ka inyeaka nke nzọpụta gị bụrụ ọta m,
36Ị na-edozi ụzọ sara mbara nye ụkwụ,
37Achụrụ m ndị iro m ọsọ, jidekwa ha;
38Etidara m ha nʼala ebe ha enwekwaghị ike ibilite.
39Ọ bụ gị nyere m ike ibu agha,
40I mere ka ndị iro m tụgharịa gbapụ ọsọ.
41Ha bere akwa maka enyemaka, ma ọ dịghị onye na-azọpụta ha.
42Egwepịara m ha nke ọma dịka ntụ nke ikuku na-ebufu;
43Ị napụtala m site nʼaka ndị na-alụso m ọgụ
44Ndị ala ọzọ na-ehulata nʼihu m nʼihi egwu,
45Obi na-ada ha mba;
46Onyenwe anyị na-adị ndụ! Otuto dịrị oke nkume m!
47Ọ bụ Chineke ahụ onye na-abọrọ m ọbọ,
48onye na-anapụta m site nʼaka ndị iro m.
49Nʼihi nke a, Onyenwe anyị, aga m eto gị nʼetiti mba niile dị iche iche,
50Ọ na-enye eze ya mmeri dị ukwuu;