1Toonu Onyenwe anyị.
2Toonu ya, ndị mmụọ ozi ya niile,
3Toonu ya, anyanwụ na ọnwa
4Toonu ya, unu eluigwe kachasị elu
5Ka ha niile too aha Onyenwe anyị,
6O doro ha nʼọnọdụ ha ga-anọ ruo mgbe ebighị ebi;
7Toonu Onyenwe anyị, site nʼụwa,
8na amụma, na mkpụrụ mmiri, na snoo na igwe ojii niile,
9unu ugwu ukwu niile, na ugwu nta niile
10na anụ ọhịa, na anụ ụlọ niile,
11ndị eze niile nke ụwa na mba niile dị iche iche,
12ụmụ okorobịa na ụmụ agbọghọ,
13Ka ha niile too aha Onyenwe anyị,
14O meela ka mpi148:14 Mpi bụ ihe na-egosipụta ike, gụọ akwụkwọ 1Sa 2:1 ndị ya dị elu,