1Aga m ebuli gị elu, Chineke m onye bụ eze;
2Ụbọchị niile ka m ga-eto gị
3Onyenwe anyị dị ukwuu, bụrụkwa onye kwesiri ịnata otuto;
4Otu ọgbọ ga-eto ọrụ gị niile nʼihu ọgbọ ọzọ;
5Ha ga-ekwupụta ihe banyere ịdị ebube nke ịma mma gị,
6Ha ga-ekwupụta ihe banyere ike nke ọrụ ịtụnanya gị niile,
7Ha ga-eme mmemme nʼihi ịdị mma gị dị ukwuu
8Onyenwe anyị na-eme amara nweekwa obi ọmịiko,
9Onyenwe anyị dị mma nʼebe mmadụ niile dị;
10O Onyenwe anyị, ihe niile i kere eke ga-eto gị;
11Ha ga-ekwupụta banyere ebube nke alaeze gị.
12ka mmadụ niile mata ihe banyere ọrụ ukwuu gị niile dị iche iche
13Alaeze gị bụ alaeze na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi,
14Onyenwe anyị na-ekulite ndị niile dara ada
15Olileanya ihe niile dị na gị,
16I na-asaghepụ aka gị
17Ụzọ Onyenwe anyị niile ziri ezi;
18Onyenwe anyị na-anọ nso ndị niile na-akpọku ya,
19Ọ na-emezu ọchịchọ niile nke ndị na-atụ egwu ya;
20Onyenwe anyị na-echebe ndị niile hụrụ ya nʼanya,
21Ọnụ m ga-ekwupụta otuto Onyenwe anyị;