1O Onyenwe anyị, ana m akpọku gị; bịakwute m ọsịịsọ.
2Ka ekpere m bịa nʼihu gị dịka ihe na-esi isi ụtọ;
3Nyere m aka ka m mechie ọnụ m, o Onyenwe anyị;
4Ekwela ka obi m nwee mmasị nʼihe ọjọọ,
5Ka onye ezi omume tie m ihe, nke a na-egosi obi ebere;
6A ga-esite nʼelu nkume dị elu tụda ndị na-achị ha,
7Ha ga-ekwu sị, “Dịka mmadụ na-egburi, na-akọgharị ala,
8Ma olileanya m dị na gị, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị
9Napụta m ka m ghara ịdaba nʼime ọnya igbudu niile nke ndị na-eme ajọ ihe siiri,
10Ka ndị ajọ omume daba nʼime ụgbụ ha,