1O Onyenwe anyị, dọpụta m site nʼaka ndị na-eme ihe ọjọọ.
2Ndị na-atụ atụmatụ ime ihe ọjọọ nʼobi ha
3Ha na-eme ire ha ka ha dị nkọ dịka nke agwọ;
4Chebe m Onyenwe anyị, ka m ghara ịdaba nʼaka ndị na-emebi iwu;
5Ndị mpako esielera m ọnya igbudu;
6A sịrị m Onyenwe anyị, “Gị onwe gị bụ Chineke m.”
7Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị Onye nzọpụta m dị ike,
8Ekwekwala ka ndị ajọ omume chọta ihe ha na-achọ, o Onyenwe anyị,
9Ndị niile gbara m gburugburu na-ebuli isi ha elu na nganga
10Ka icheku ọkụ na-ere ere dakwasị ha;
11Ekwela ka ndị na-ekwu okwu nkwulu guzosie ike nʼala,
12Amaara m na Onyenwe anyị ga-ekpe ikpe ziri ezi nye ndị ogbenye
13Nʼezie, ndị ezi omume ga-eto aha gị,