1O Onyenwe anyị, ị nyochaala m,
2Ị maara mgbe m na-anọdụ ala na mgbe m na-eguzo ọtọ;
3Ị na-ahụzu ọpụpụ m na ndina ala m;
4O Onyenwe anyị, ị maara ihe m gaje ikwu
5Ị na-anọ m nʼihu, ma na-esokwa m nʼazụ,
6Ihe ọmụma dị otu a dị oke omimi nye m,
7Ebee ka m ga-ezo onwe m si otu a zonarị Mmụọ gị?
8Ọ bụrụ na m arịgoro nʼeluigwe ị nọ nʼebe ahụ.
9Ọ bụrụ na m efepụ nʼisi ụtụtụ dịka nwa nnụnụ, felagaa
10ọ bụladị nʼebe ahụ ka aka gị ga na-edu m
11Ọ bụrụ na m asị, “Nʼezie, ọchịchịrị ga-ekpuchi m
12Ọ bụladị ọchịchịrị agaghị abụ ọchịchịrị nʼebe ị nọ;
13Ọ bụ gị kpụrụ akụkụ niile dị m nʼahụ.
14Ana m eto gị nʼihi na abụ m onye e sitere nʼoke egwu na ebube kee;
15Ụdịdị m abụghị ihe zoro ezo nʼebe ị nọ
16Anya gị abụọ hụrụ ahụ m mgbe ọ na-enweghị ụdịdị ọbụla.
17Lee ka echiche ị na-eche banyere m si dị oke ọnụahịa, o Chineke!
18Ọ bụrụ na m agụọ ha ọnụ,
19O Chineke, a sịkwarị na ị ga-ala ndị ajọ omume niile nʼiyi!
20Site nʼechiche ọjọọ, ha na-ekwu okwu banyere gị;
21O Onyenwe anyị, ọ bụ na m akpọghị ha asị bụ ndị kpọrọ gị asị,
22Ọ bụ naanị ịkpọ asị ka m nwere nʼebe ha nọ?
23O Chineke, nyochaa m, mara obi m.
24Chọpụta ma o nwere ihe ọjọọ dị nʼime m,