We Believe JesusFé, Esperança e Nova Vida

Abụ Ọma 136

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · ib

← Abụ Ọma 135 Abụ Ọma Abụ Ọma 137 →

1Keleenụ Onyenwe anyị, nʼihi na ọ dị mma.

2Keleenụ Chineke kachasị chi niile elu.

3Keleenụ Onyenwenụ kachasị ndị nwenụ niile.

4Keleenụ onye ahụ naanị ya na-arụ ọrụ ebube dị iche iche,

5Keleenụ onye ahụ ji nghọta ya kee mbara eluigwe niile,

6Keleenụ onye wuru ụwa nʼelu ogbu mmiri,

7Keleenụ onye ahụ kere anyanwụ na ọnwa,

8Onye mere anyanwụ ka ọ na-acha nʼehihie,

9Onye mere ka ọnwa na kpakpando na-achị nʼabalị,

10Onye ahụ tigburu ụmụ niile e buru ụzọ mụọ nʼIjipt,

11O duuru ndị Izrel site nʼIjipt pụta,

12O ji aka ya dị ike nke o setịpụrụ esetipụ dupụta ha;

13Onye ahụ kewara Osimiri Uhie abụọ,

14Onye duuru ndị Izrel gafee nʼetiti ya,

15Ma Osimiri Uhie riri Fero na ndị agha ya niile;

16Keleenụ onye duuru ndị ya gafee ọzara,

17Onye ahụ tigburu ndị eze dị ukwuu,

18O gbukwara ndị eze dị ike nke ukwuu,

19O gburu Saịhọn eze ndị Amọrait,

20Na Ọg eze Bashan,

21Were ala ha nye dịka ihe nketa,

22O nyere ohu ya Izrel ala ahụ ka ọ bụrụ ihe nketa ha,

23Onye chetara anyị mgbe anyị na-adịghị ike,

24Mee ka anyị nwere onwe anyị site nʼaka ndị iro anyị,

25Ọ na-enye ihe niile dị ndụ nri,

26Keleenụ Chineke nke eluigwe ekele.

← Abụ Ọma 135 Abụ Ọma Abụ Ọma 137 →