1Ahụrụ m Onyenwe anyị nʼanya, nʼihi na ọ nụrụ olu m;
2Nʼihi na o gere m ntị,
3Agbụ nke ọnwụ kekọrọ m,
4Mgbe ahụ, akpọkuru m aha Onyenwe anyị:
5Onyenwe anyị bụ onye na-eme ebere na onye ezi omume.
6Onyenwe anyị na-echebe ndị na-enweghị uche;
7Laghachi azụ zuru ike, gị mkpụrụobi m,
8Nʼihi na gị, o Onyenwe anyị, napụtara mkpụrụobi m site nʼọnwụ,
9ka m nwee ike jegharịa nʼihu Onyenwe anyị
10Ekwenyere m na Onyenwe anyị mgbe m kwuru sị,
11nʼime ịda mba m, ekwuru m sị,
12Gịnị ka m ga-enyeghachi Onyenwe anyị
13Aga m eweli iko nke nzọpụta m elu
14Nʼihu ndị ya niile ka m ga-anọ
15Ọnwụ nke ndị nsọ ya
16O Onyenwe anyị, nʼezie, abụ m ohu gị;
17Aga m achụrụ gị aja ekele
18Ọ bụkwa nʼihu ndị ya niile
19nʼime ogige ụlọ Onyenwe anyị,