1Ọ bụghị anyị ka ọ dịrị, o Onyenwe anyị, ọ bụghị anyị ka ọ dịrị,
2Gịnị mere ọtụtụ mba niile nke ụwa ji na-ajụ sị,
3Chineke anyị bi nʼeluigwe.
4Arụsị ha niile bụ ọlaọcha na ọlaedo ka e ji kpụọ ha,
5Ha nwere ọnụ ma ha adịghị ekwu okwu,
6ha nwere ntị ma ha adịghị anụ ihe,
7ha nwere aka, ma ha adịghị emetụ ihe ọbụla aka,
8Ndị na-eme ha ga-adịkwa ka ha.
9Ụmụ Izrel, tụkwasịnụ Onyenwe anyị obi
10Ezinaụlọ Erọn, tụkwasịnụ Onyenwe anyị obi.
11Unu ndị na-atụ egwu ya, tụkwasịnụ Onyenwe anyị obi
12Onyenwe anyị na-echeta anyị, ọ ga-agọzikwa anyị,
13ọ ga-agọzi ndị niile na-atụ egwu Onyenwe anyị,
14Ka Onyenwe anyị mee ka unu mụbaa,
15Ka Onyenwe anyị onye kere eluigwe na elu ụwa
16Eluigwe niile bụ nke Onyenwe anyị,
17Ọ bụghị ndị nwụrụ anwụ na-eto Onyenwe anyị,
18ọ bụ anyị ga-aja Onyenwe anyị mma,