We Believe JesusFé, Esperança e Nova Vida

Abụ Ọma 107

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · ib

← Abụ Ọma 106 Abụ Ọma Abụ Ọma 108 →

1Keleenụ Onyenwe anyị, nʼihi na ọ dị mma;

2Ka ndị niile Onyenwe anyị gbapụtara kwuo otu a,

3ndị ọ kpọlatara site nʼala niile dị iche iche,

4Ụfọdụ wagharịrị nʼọzara, ala nke tọgbọrọ nʼefu,

5Agụụ gụrụ ha, akpịrị kpọkwara ha nkụ,

6Mgbe ahụ, ha kpọkuru Onyenwe anyị, nʼime nsogbu ha,

7O duuru ha nʼụzọ ziri ezi

8Ka ha kelee Onyenwe anyị nʼihi ịhụnanya ya nke na-adịghị agwụ agwụ

9nʼihi na o jirila ọtụtụ ezi ihe nyejuo ndị agụụ na-agụ afọ

10Ụfọdụ nọdụrụ ala nʼọchịchịrị na nʼọnọdụ oke ihe mwute nke obi,

11nʼihi na ha nupuru isi megide okwu niile nke Chineke

12Nʼihi ya, Chineke mere ka ha hụjuo anya site nʼịdọgbu onwe ha nʼọrụ,

13Mgbe ahụ, ha kpọkuru Onyenwe anyị nʼime nsogbu ha,

14O mere ka ha site nʼọchịchịrị na oke ihe mwute nke obi pụta.

15Ka ha kelee Onyenwe anyị nʼihi ịhụnanya ya, nke na-adịghị agwụ agwụ

16nʼihi na o tijisiela ọnụ ụzọ ama niile e ji bronz kpụọ

17Ụfọdụ ghọrọ ndị nzuzu site na nnupu isi

18Ihe oriri ọbụla ghọọrọ ha ihe rụrụ arụ

19Mgbe ahụ, ha kpọkuru Onyenwe anyị nʼime nsogbu ha

20O zipụrụ okwu ọnụ ya, gwọọ ha;

21Ka ha kelee Onyenwe anyị nʼihi ịhụnanya ya nke na-adịghị agwụ agwụ

22Ka ha chụọ aja ekele nye ya

23Ụfọdụ ji ụgbọ mmiri na-ejegharị nʼelu oke osimiri;

24Ha hụrụ ọrụ niile nke Onyenwe anyị,

25Nʼihi na o kwuru okwu mere ka oke ifufe kuo

26Ha bụ ndị e buliri nnọọ ezigbo elu, ma budatakwa ruo ogbu mmiri niile;

27Ha na-adagharị, na-aṅagharịkwa dịka ndị ṅụbigara mmanya oke.

28Mgbe ahụ, ha kpọkuru Onyenwe anyị nʼime nsogbu ha,

29O mere ka oke ifufe dere duu;

30Ha ṅụrịrị ọṅụ mgbe ọ dajụrụ,

31Ka ha kelee Onyenwe anyị nʼihi ịhụnanya ya nke na-adịghị agwụ agwụ

32Ka ha bulie ya elu nʼetiti ọgbakọ ukwu ụmụ mmadụ

33Ọ na-eme ka iyi ghọọ ọzara;

34Ọ na-eme ka ala na-amị mkpụrụ hiri nne ghọọ ọzara,

35Ọ na-eme ka ọzara ghọọ ala nke ọdọ mmiri jupụtara

36ebe ahụ ka ọ kpọbatara ndị agụụ na-agụ ka ha biri,

37Ha ghara mkpụrụ nʼubi ha dị iche iche, kụọkwa ọtụtụ ubi vaịnị

38ọ gọziri ha, ọnụọgụgụ ha bakwara ụba,

39Mgbe ahụ, ọnụọgụgụ ha adịghịkwa ka ọ dị na mbụ,

40onye ahụ na-eleda ndị na-achị achị anya

41Ma ọ na-anapụta ndị mkpa na-akpa site na nhụju anya ha,

42Ndị ezi omume na-ahụ ya na-aṅụrị ọṅụ,

43Onye ọbụla maara ihe ga-echezi echiche banyere ihe ndị a,

← Abụ Ọma 106 Abụ Ọma Abụ Ọma 108 →