1Nyenụ Onyenwe anyị otuto, kwupụtakwa aha ya.
2Bụkuo ya abụ, bụkuo ya abụ otuto;
3Ṅụrianụ nʼime aha nsọ ya;
4Na-achọnụ Onyenwe anyị na ike ya,
5Chetanụ ọrụ ebube niile nke ọ rụrụ,
6unu ụmụ ụmụ Ebraham, bụ ohu ya,
7Ya onwe ya bụ Onyenwe anyị Chineke anyị;
8Ọ na-echeta ọgbụgba ndụ ya ruo mgbe ebighị ebi,
9ọgbụgba ndụ ahụ nke ya na Ebraham gbara
10O mere ka o guzoro nye Jekọb dịka ụkpụrụ,
11“Aga m enye gị ala Kenan
12Mgbe ha dị ole na ole nʼọnụọgụgụ,
13Ha wagharịrị site nʼotu mba gaa na mba ọzọ,
14O kweghị ka onye ọbụla mekpaa ha ahụ;
15sị, “Unu emetụkwala ndị m e tere mmanụ aka;
16O zitere ụnwụ nʼala ahụ,
17o zipụrụ otu nwoke ka ọ gaa nʼihu ha,
18Ha ji mkpọrọ igwe merụọ ya ahụ nʼụkwụ,
19tutu ruo mgbe ihe ahụ o kwuru na ọ ga-eme mezuru,
20Eze ahụ zipụrụ ozi ka a tọpụ ya,
21O mere ya ka ọ bụrụ onyenwe ezinaụlọ ya,
22ikuziri ụmụ eze ndị ikom dịka o si masị ya,
23Mgbe ahụ, Izrel bara nʼala Ijipt;
24Onyenwe anyị mere ka ndị ya mụbaa nke ukwuu;
25ndị ọ tụgharịrị obi ha ka ha kpọọ ndị ya asị,
26O zipụrụ Mosis, ohu ya,
27Ha mere ọtụtụ ihe ịrịbama dị iche iche nʼetiti ha,
28O zipụrụ ọchịchịrị, mee ka ala ahụ gbaa ọchịchịrị,
29O mere ka mmiri ha niile ghọọ ọbara,
30Ala ha niile jupụtara nʼawọ
31O kwuru okwu, igwe ijiji na anwụ nta
32Nʼọnọdụ mmiri ozuzo, o zitere ha
33o tijisịrị osisi vaịnị na osisi fiig niile ha,
34O kwuru okwu, igurube na ụkpana
35ha richapụrụ ihe niile bụ ahịhịa ndụ dị nʼala ahụ,
36Mgbe ahụ, o gburu ndị niile e buru ụzọ mụọ nʼala ahụ,
37Ọ kpọpụtara ụmụ Izrel, ndị chịịrị ọlaọcha na ọlaedo,
38Obi dị Ijipt ụtọ mgbe ha pụrụ,
39Ọ gbasara igwe ojii dịka ihe mkpuchi,
40Ha rịọrọ ya, o zitere ha ụmụ nnụnụ kweel,
41O tiwara nkume ahụ, mmiri sọpụtara;
42Nʼihi na o chetara nkwa ya dị nsọ,
43O ji aṅụrị dupụta ndị ya,
44o nyere ha ala niile nke mba dị iche iche,
45ka ha nwee ike debe ụkpụrụ ya niile