1Mkpụrụobi m, too Onyenwe anyị.
2Ọ na-eji ìhè kpuchie onwe ya dịka akwa;
3na-atọ ntọala ụlọ elu ya nʼelu mmiri.104:3 Ems 9:6
4O ji oke ifufe mere ihe na-ejere ya ozi,
5Ọ bụ ya tọrọ ntọala ụwa;
6I gbokwasịrị ogbu mmiri nʼelu ya dịka ọ bụ uwe ka i yikwasịrị ya,
7Ma mgbe ị bara mba, mmiri ahụ gbapụrụ,
8Ha sitere nʼelu ugwu niile,
9Ị kpara oke nye ha, nke ha na-agaghị agafe,
10Ọ na-eme ka mmiri, site nʼala na-asọpụta na ndagwurugwu,
11Ha na-enye anụ ọhịa niile mmiri ọṅụṅụ
12Nʼosisi dị nʼakụkụ ha ka ụmụ anụ ufe nke eluigwe ga-anọ wuo akwụ ha;
13Ọ na-esite nʼeluigwe na-ezidata mmiri ozuzo nʼelu ugwu niile;
14Ọ na-eme ka ahịhịa puputara anụ ụlọ,
15mmanya nke na-enye obi mmadụ aṅụrị,
16A na-agba osisi niile nke Onyenwe anyị mmiri nke ọma,
17Ụmụ nnụnụ na-ewu akwụ ha;
18Ugwu niile dị elu dịịrị ewu ọhịa;
19I mere ọnwa ka ọ bụrụ ihe a ga-eji na-agụ oge na mgbe dị iche iche;
20Ị na-eme ka ọchịchịrị bịa, ọ bụrụ abalị;
21Ụmụ ọdụm na-agbọ ụja ha na-elegharị anya anụ ha ga-adọgbu,
22Nʼisi ụtụtụ mgbe anwụ wara,
23Ụmụ mmadụ na-amalitekwa ọrụ ha nʼisi ụtụtụ,
24Onyenwe anyị, ọrụ aka gị dị ọtụtụ.
25Leenụ osimiri nke buru ibu saakwa mbara;
26Nʼebe ahụ ka ụgbọ mmiri niile na-ejegharị,
27Ha niile na-adabere na gị,
28Ị na-enye ha nri;
29Mgbe i zonarịrị ha ihu gị,
30Mgbe i zipụrụ mmụọ gị,
31Ka ebube Onyenwe anyị dịgide site nʼebighị ebi ruo nʼebighị ebi;
32onye na-ele ụwa anya, ụwa amaa jijiji,
33Aga m abụku Onyenwe anyị abụ ogologo ụbọchị niile nke ndụ m;
34Ka ntụgharị uche m niile bụrụ ihe na-atọ ya ụtọ,
35Ka e kpochapụ ndị mmehie niile site nʼụwa.