1Amamihe ewuola ụlọ ukwu ya
2O doziela oriri ya nʼusoro,
3O zipụkwala ndị ozi ya ka ha gaa kpọọ mmadụ niile,
4“Bịanụ nʼụlọ m, unu ndị niile na-enweghị uche”
5“Bịanụ, rie nri m,
6Hapụnụ ụzọ enweghị uche unu, ka unu were dị ndụ;
7Onye ọbụla na-adọ onye na-akwa emo aka na ntị na-ewetara onwe ya nlelị;
8Abarala ndị na-akwa emo mba, ma ọ bụghị ya, ha ga-akpọ gị asị;
9Kuziere onye maara ihe ihe o kwesiri ịmụta, ọ ga-ama ihe karịa,
10Nʼihi na ịtụ egwu Onyenwe anyị bụ mmalite amamihe,
11Nʼihi na ọ bụ site na amamihe, ka ụbọchị gị ga-adị ogologo.
12Ị bụrụ onye nwere amamihe, amamihe gị ga-abara gị uru,
13Nwanyị dị nzuzu na-eme mkpọtụ,
14Ọ na-anọ ọdụ nʼọnụ ụzọ ụlọ ya,
15na-akpọ ndị na-aga nʼụzọ oku,
16“Ka ndị niile amamihe kọrọ bịa nʼụlọ m.”
17“Mmiri e zutere nʼohi na-atọ ụtọ,
18Ma ha adịghị aghọta na ndị nʼadịghị ndụ nọ nʼebe ahụ,