1Ilu dị iche iche nke Solomọn:
2Akụ a kpatara nʼụzọ na-ezighị ezi adịghị aba uru,
3Onyenwe anyị agaghị ekwe ka onye ezi omume nwụọ nʼagụụ,
4Aka ndị umengwụ na-eweta ogbenye,
5Onye na-ekpokọta nʼoge ọkọchị bụ nwa maara ihe,
6Onye ezi omume na-anata ngọzị,
7Aha onye ezi omume ka eji enye ngọzị,
8Onye obi ya maara ihe na-anabata ihe e nyere nʼiwu,
9Onye ụzọ ya ziri ezi na-aga ije nʼatụghị egwu,
10Onye ọbụla na-egbu ikuanya na-ebute ihe mwute,
11Ọnụ onye ezi omume bụ isi iyi nke ndụ,
12Ịkpọ asị na-akpali esemokwu,
13Ndị nwere nghọta na-ekwu okwu nwere isi,
14Onye amamihe na-akpakọba ihe ọmụma,
15Akụ ndị ọgaranya bụrụ ha obodo e wusiri ike,
16Ụgwọ ọrụ onye ezi omume bụ ndụ,
17Onye na-ege ntị na ndụmọdụ na-egosi ụzọ nke ndụ,
18Onye ji egbugbere ọnụ ụgha ekpuchi ịkpọ asị
19Nʼọtụtụ okwu mmehie adịghị akwụsị
20Ire nke onye ezi omume bụ ọlaọcha kachasị mma,
21Egbugbere ọnụ onye ezi omume na-azụju ọtụtụ mmadụ afọ,
22Ngọzị Onyenwe anyị na-eme mmadụ ọgaranya,
23Ihe na-atọ onye nzuzu ụtọ bụ izube nzube ọjọọ;
24Ihe ahụ onye na-emebi iwu nʼatụ ụjọ ya ga-abịakwasị ya,
25Mgbe oke ifufe na-emebi ihe, ndị na-emebi iwu ka ọ na-eburu;
26Onye umengwụ na-abụ ihe mgbu nye onyenwe ya;
27Ịtụ egwu Onyenwe anyị na-enye ogologo ndụ,
28Olileanya ndị ezi omume ga-abụ ọṅụ;
29Ụzọ Onyenwe anyị bụ ebe mgbaba nye ndị na-enweghị ịta ụta,
30A pụghị iwezuga10:30 Maọbụ, ihopu onye ezi omume,
31Nʼọnụ onye ezi omume ka mkpụrụ amamihe si abịa,
32Egbugbere ọnụ onye ezi omume mara ihe na-eweta ihuọma,