1Na-agbaso okwu m nwa m, nọgide na ya,
2Debe iwu m ka ị dị ndụ,7:2 Lev 18:5; Aịz 55:3
3Kee ha na mkpịsịaka gị,
4Hụ amamihe nʼanya dịka nwaagbọghọ ị hụrụ nʼanya;
5Kwee ka ha debe gị, ka ị ghara ijekwuru nwanyị na-akwa iko,
6Nʼihi na otu ụbọchị,
7hụ nʼetiti ndị na-enweghị uche,
8ka ọ na-aga nʼụzọ dị nso ebe nkuku ụlọ
9nʼoge anyasị, dịka chi na-eji,
10Mgbe ahụ, nwanyị ahụ pụtara zute ya.
11(Ọ na-eme ụzụ na-aṅaghị ntị ịnụ ihe ọbụla.
12Ọ na-akwụgharị ma nʼokporoụzọ ma nʼama;
13O weere aka ya abụọ jikụọ nwokorobịa ahụ nʼolu, sutu ya ọnụ,
14“Emezuru m nkwa niile m kwere taa,
15Ọ bụ gị ka m na-achọkwute,
16Agbasaala m akwa mara mma nʼelu ihe ndina m,
17Efesakwala m mmanụ isi ọma nke máá, aloos na sinamọn
18Bịa, ka anyị were ịhụnanya ṅụjụbiga afọ anyị;
19Nʼihi na di m anọghị nʼụlọ
20O ji akpa ego juru gaa njem,
21Otu a ka o si jiri okwu ire ụtọ ya megharịa nwokorobịa ahụ isi tutu o kwenyere ya.
22O sooro nwanyị ahụ dịka ehi
23nke na-eche ka e were àkụ gbata ya nʼobi.
24Geenụ ntị, ụmụ m, ma ọ bụghị naanị ige ntị,
25Ekwela ka agụụ nke obi gị chịa gị;
26Nʼihi na o mebiela ndụ ọtụtụ mmadụ,
27Ụlọ ya bụ okporoụzọ nke na-eduba nʼili,