We Believe JesusFé, Esperança e Nova Vida

Ilu 6

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · ib

← Ilu 5 Ilu Ilu 7 →

1Nwa m, ọ bụrụ na ị nara onye agbataobi gị nʼibe,

2ị bụrụla onye mara nʼọnya site nʼihe ị kwuru,

3Mee nke a, nwa m, si nʼime ya wepụ onwe gị;

4Ekwekwala ka ụra baa gị anya abụọ,

5Napụta onwe gị, dịka mgbada site nʼaka dinta,

6Gaa mụta ihe site nʼaka ndanda, gị onye umengwụ.

7Ọ bụ ezie na o nweghị eze na-achịkọta ha,

8ma ọ na-akpakọta nri ya nʼoge ọkọchị

9Ọ bụ ruo ole mgbe ka ị ga-edina ala nʼebe ahụ, gị onye umengwụ?

10Nwa ụra nta, nwa iru ụra nta,

11ụbịam ga-abịakwasị gị dịka onye ohi,

12Onye okwu na ụka na onye omume ya jọgburu onwe ya,

13onye ji iro na-egbu ikuanya ya,

14Onye obi ya na-echepụta ihe ọjọọ na aghụghọ,

15Nʼihi ya, mbibi ga-abịakwasị ya na mberede;

16Ọ dị ụzọ ihe isii Onyenwe anyị kpọrọ asị,

17Anya dị nganga,

18Obi na-echepụta nzube ọjọọ;

19onyeama ụgha na-awụpụ ụgha dịka mmiri

20Nwa m, debe ihe nna gị nyere gị nʼiwu,

21Ka ndụmọdụ ha dịrị gị nʼobi mgbe niile,

22Mgbe ị na-ejegharị, ọ ga na-edu gị;

23Nʼihi na iwu a bụ oriọna,6:23 Abụ 119:105

24idebe gị ka ị pụọ nʼebe nwunye onye agbataobi gị nọ,

25Ekwela ka agụ nʼezighị ezi gụọ gị nʼime obi nʼihi ịma mma ya,

26Nʼihi na nwanyị akwụna ka enwere ike iji otu ogbe achịcha nweta,

27Mmadụ ọ pụrụ ịgụrụ ọkụ tụkwasị nʼahụ ya,

28Mmadụ ọ pụrụ ije ije nʼelu icheku ọkụ

29Otu a ka ọ na-adịrị nwoke na-abakwuru nwunye mmadụ ibe ya;

30Ndị mmadụ adịghị eleda onye ohi anya ma ọ bụrụ na o zuo ohi

31Ma ọ bụrụ na ejide ya ọ ga-akwụghachi ụgwọ ihe niile ahụ o zuru okpukpu asaa.

32Ma nwoke ahụ na-akwa iko bụ onye nzuzu, amamihe kọrọ ya,

33A ga-eti ya ezi ihe otiti, a ga-elelikwa ya anya,

34Nʼihi na di nwanyị ahụ ga-esite nʼekworo wee iwe dị ọkụ;

35Ọ gaghị anara ihe ọbụla nʼọnọdụ ihe nkwụghachi nʼihi ihe ọjọọ o mere ya.

← Ilu 5 Ilu Ilu 7 →