1Nwa m, ṅaa ntị nʼokwu amamihe m,
2Lezie anya, ka i debe izuzu dị iche iche,
3Nʼihi na egbugbere ọnụ nwanyị na-akwa iko na-atọ ka mmanụ aṅụ,
4Ma nʼikpeazụ, ọ na-elu ilu dịka oluilu
5Ụkwụ ya abụọ na-arịdaru nʼọnwụ,
6Nʼihi na ọ dịghị agbaso ụzọ kwesiri ndụ;
7Ugbu a ụmụ m, geenụ m ntị,
8Gbaara nwanyị dị otu a ọsọ!
9ka ị ghara ire ugwu gị nʼebe ndị ọzọ nọ,
10Ka ndị ọbịa ghara inwe oke oriri nʼelu akụ gị,
11Ka ị gharakwa ịsụ ude nʼikpeazụ
12Mgbe ị ga-asị, Lee ka m si kpọọ ịdọ aka na ntị asị!
13Egeghị m ntị nʼozizi nke ndị nkuzi m
14Nʼihi na ugbu a, abịaruola m na mbibi
15Ṅụọ naanị mmiri nke si nʼite mmiri gị;
16Gịnị mere ị ga-eji kwe ka isi mmiri gị sọọ nʼokporoụzọ,
17Kwee ka ha bụrụ nke naanị gị,
18Kwere ka ịbụ nwoke gị bụrụ ngọzị nye gị;
19Nne anụ nke na-ahụ nʼanya, dịka ele mara mma,
20Gịnị ka ị na-achọ nʼahụ nwanyị na-akwa iko?
21Nʼihi na Onyenwe anyị na-ele gị anya,
22Onye na-emebi iwu na-esite na mmehie ya laa onwe ya nʼiyi;
23Ọ ga-anwụ nʼihi na ọ nabataghị ịdọ aka na ntị;