We Believe JesusFé, Esperança e Nova Vida

Ilu 4

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · ib

← Ilu 3 Ilu Ilu 5 →

1Ụmụ m ndị ikom, geenụ ntị na ndụmọdụ nke nna unu,

2Ṅaanụ ntị, nwee uche, nʼihi na ọ bụ ezi ozizi ka m na-ezi unu;

3Mgbe m bụ nwantakịrị nʼụlọ nna m,

4ọ ziri m ihe, sịkwa m,

5Nweta amamihe, nwetakwa nghọta,

6Ahapụla amamihe, ọ ga-echebe gị,

7Mmalite amamihe bụ nke a, nweta amamihe,

8Ọ bụrụ na i bulie amamihe elu, o ga-ebulikwa gị elu.

9Ọ ga-eji okpueze okoko osisi chọọ isi gị mma

10Nwa m, ṅaa m ntị, meekwa ihe m gwara gị;

11M ga-edu gị nʼụzọ nke amamihe,

12Ọ bụrụ na i bie ụdị ndụ dị otu a, ihe agaghị akpọ gị nʼụkwụ nʼije gị,

13Mee ihe niile m gwara gị, echefukwala ha,

14Emela dịka ndị na-emebi iwu.

15Zeere ha, ejekwala nʼụzọ ha;

16nʼihi na ndị na-emebi iwu adịghị arahụ ụra tutu ha emee arụ nke ụbọchị ahụ.

17Ha na-eri ihe oriri nke mmebi iwu,

18Ma ụzọ ndị ezi omume dị ka anyanwụ na-awa nʼisi ụtụtụ,

19Ma ụzọ onye na-emebi iwu dị ka itiri nke ọchịchịrị,

20Gee ntị nwa m, nʼihe m na-ekwu.

21Doo ihe ndị a nʼuche gị mgbe niile;

22nʼihi na ha bụ ndụ nye ndị chọtara ha,

23Nke ka nke, lezie echiche uche gị niile anya,

24Ka ụgha ọbụla ghara isi gị nʼọnụ pụta;

25Legide anya nʼihu ime ihe bụ eziokwu;

26Leruo ije ụkwụ gị anya,

27Ewezugala onwe gị site nʼaka nri maọbụ nʼaka ekpe;

← Ilu 3 Ilu Ilu 5 →