1Nwa m echezọla ihe niile m ziri gị.
2Nʼihi na ha ga-eme ka ndụ gị dị ogologo ruo ọtụtụ afọ,
3Ekwela ka ịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi hapụ gị,
4Mgbe ahụ, ị ga-enwe ihuọma na ezi aha
5Tụkwasị Onyenwe anyị obi gị niile,
6Nʼihe ọbụla ị na-eme, ka Chineke bute ụzọ,
7A bụla onye maara ihe nʼanya nke onwe gị.
8Nke a ga-eme ka i nwee ahụ ike
9Sọpụrụ Onyenwe anyị site nʼinye ya mkpụrụ mbụ nke akụnụba gị,
10Mgbe ahụ ka ọ ga-eme ka ọba gị niile jubigakwa oke,
11Nwa m nwoke ajụla ịdọ aka na ntị nke Onyenwe anyị,
12Nʼihi na ọ bụ ndị Onyenwe anyị hụrụ nʼanya ka ọ na-abara mba,
13Onye a gọziri agọzi ka mmadụ ahụ bụ onye chọtara amamihe,
14Nʼihi na amamihe dị mma karịa ọlaọcha,
15Ọ dị oke ọnụahịa karịa ọla rubi,
16Ndụ ogologo dị nʼaka nri ya;
17Ụzọ ya bụ ụzọ dị mma
18Amamihe bụ osisi nke ndụ3:18 Jen 2:9; Ilu 11:30; Ilu 15:4; Mkp 2:7 nye ndị na-ejide ya aka,
19Ọ bụ site nʼamamihe ka Onyenwe anyị ji tọọ ntọala ụwa;
20Esitere nʼihe ọmụma ya kewaa ogbu mmiri niile,
21Nwa m nwoke, ekwela ka ihe abụọ ndị a site nʼihu gị wezuga onwe ha:
22nʼihi na ha na-enye gị ndụ ọhụrụ,
23Ha na-eme ka ị na-aga ije nʼụzọ gị na-enweghị ihe egwu
24Mgbe ị ga-edina ala, ị gaghị atụ egwu,
25Ị gaghị atụ egwu ihe mbibi mberede ọbụla
26Nʼihi na Onyenwe anyị bụ ebe ndabere gị,
27Ejigidele ihe ọma ị pụrụ imere onye ọzọ
28A sịkwala onye agbataobi gị laa,
29Agbala izu ọjọọ megide onye agbataobi gị,
30Ebola mmadụ ebubo na-enweghị isi,
31Ekwosola onye na-eme ihe ike ekworo
32Nʼihi na ndị dị otu a bụ ihe arụ nʼanya Onyenwe anyị,
33Ọbụbụ ọnụ Onyenwe anyị dị nʼụlọ ndị na-eme ajọ omume,
34Ndị mpako na-akwa emo ka ya onwe ya na-akwakwa emo,
35Ndị maara ihe na-enweta nsọpụrụ,