We Believe JesusFé, Esperança e Nova Vida

Ilu 2

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · ib

← Ilu 1 Ilu Ilu 3 →

1Nwa m, ọ bụrụ na ị nabata okwu ọnụ m niile

2tọọ ntị gị nʼala nye amamihe,

3E, ọ bụrụ na ọ bụ ihe ọmụma ka ị na-akpọku,

4ọ bụrụ na ị na-achọ ya dịka i si achọ ọlaọcha

5mgbe ahụ, ị ga-aghọtakwa ihe bụ ịtụ egwu Onyenwe anyị

6Nʼihi na ọ bụ Onyenwe anyị na-enye amamihe;

7Ọ na-edebere ndị ụzọ ha ziri ezi nzube ọganihu,

8Ọ na-echebekwa ụzọ nke ndị na-eme ezi ihe na-agbaso,

9Mgbe ahụ ka ị ga-aghọta ihe ziri ezi

10Nʼihi na amamihe ga-enwe ọnọdụ nʼime obi gị,

11Izuzu zuruoke ga-echebe gị,

12Amamihe ga-azọpụta gị site nʼụzọ ndị mmehie,

13ndị hapụrụ ụzọ niile ziri ezi nke Chineke

14ndị na-aṅụrị ọṅụ nʼihe ọjọọ,

15Ihe ọbụla ha na-eme gbagọrọ agbagọ,

16Ọ bụ naanị amamihe ga-anapụta gị nʼaka nwanyị akwụna,

17Onye na-ahapụ di ọ lụrụ nʼagbọghọ,

18Ụlọ nwanyị dị otu a dị nʼokporoụzọ

19Ndị ikom niile banyere nʼụlọ ha na-ala nʼiyi.

20Nʼihi nke a, ị ga-aga ije nʼụzọ ndị ezi omume,

21nʼihi na ọ bụ naanị ndị ziri ezi ga-ebi nʼala ahụ,

22Ma ndị na-emebi iwu ka a ga-ebipụ site nʼala ahụ,

← Ilu 1 Ilu Ilu 3 →