1Ndị a bụ ilu Solomọn nwa Devid, eze Izrel.
2Ọ bụ maka amamihe na ntụziaka,
3nʼihi inweta ntụziaka nʼinwe uche,
4Nʼihi ime ka ndị na-enweghị uche nwee ezi uche,
5Ka onye maara ihe gee ntị, tụkwasịkwa ihe nʼihe ọ maara,
6Ka ha ghọta ilu niile na okwu niile
7Ịtụ egwu Onyenwe anyị bụ mmalite ihe ọmụma.1:7 Ilu 9:10; Ilu 15:33; Ekl 12:13
8Nwa m, na-aṅa ntị na ntụziaka nke nna gị
9Nʼihi na okpu amara ka ha ga-abụrụ isi gị,
10Nwa m, ọ bụrụ na ndị mmehie ara gị ụra,
11Ọ bụrụ na ha asị gị, “Bịa soro anyị; ka anyị zoo onwe anyị,
12Ka anyị loo ha na ndụ, dịka ala ili,
13Anyị ga-enwetakwa ọtụtụ ihe dị oke ọnụahịa,
14Soro anyị fee nza gị ka anyị nwaa ike anyị,
15Nwa m, ejela ije nʼụzọ ndị dị otu a,
16nʼihi na ụkwụ ha na-agba ọsọ ime ihe ọjọọ,
17Ọ bụ ihe abaghị uru ịgbasa ụgbụ,
18Ma ndị a na-esi ọnya nke na-ama ha.
19Otu a ka ọ na-adịkwara ndị ọ na-agụsị agụụ ike inweta akụnụba nʼụzọ na-ezighị ezi.
20Amamihe na-eti mkpu nʼezi ka mmadụ nụ.
21Ọ bụ nʼisi akụkụ ụzọ nke mkpọtụ dịkarịsịrị ka ọ na-akpọ oku,
22“Unu ndị na-enweghị uche ruo ole mgbe ka unu ga-anọgide bụrụ ndị ga-ahụ enweghị uche nʼanya?
23Ọ bụrụ na unu gere ntị na mba m na-abara unu,
24Ma ebe ọ bụ na unu egeghị ntị mgbe m kpọrọ oku,
25ebe ọ bụ na unu akpọla ndụmọdụ m asị,
26ụbọchị unu ga-adaba na mmekpa ahụ, aga m achị ọchị.
27Mgbe oke ihe egwu ga-abịakwasị unu dịka ikuku dị ike,
28“Agaghị m ege ntị nʼakwa unu, ọ bụ ezie na unu ga na-akpọ m.
29Nʼihi na unu mechiri anya unu nʼebe ihe ọmụma dị,
30Unu aṅaghị ntị na ndụmọdụ m.
31Ihe niile unu kụrụ ka unu ga-aghọta.
32Nʼihi na ejezighị ije nke ndị na-enweghị uche na-egbu ha,
33Ma onye na-ege ntị nʼokwu m ga-ebi obi ntụkwasị obi.