1Ịhụ onye nzuzu a na-enye nsọpụrụ
2Dịka nnụnụ nta na-efegharị efegharị, maọbụ dịka eleke na-awụgharị
3Ụtarị dịrị ịnyịnya, ịnyịnya ibu ka a na-ekenye mkpụmkpụ igwe nʼọnụ;
4A zaghachila onye nzuzu dịka enweghị uche ya si dị,
5Zaa onye nzuzu dịka enweghị uche ya si dị,
6Iziga ozi site nʼaka onye nzuzu
7Dịka onye ngwụrọ si eji ụkwụ ya eje ije,
8Ọ baghị uru inye onye nzuzu nsọpụrụ, nʼihi na ọ gaghị anọgide.
9Dịka ogwu manyere nʼaka onye na-aṅụbiga mmanya oke
10Dịka ọgba ụta si agba ụta ya na-enweghị onye o bụ nʼobi,
11Dịka nkịta laghachiri ọzọ nʼihe ọ gbọrọ,
12Ị hụrụ onye mara ihe nʼanya nke onwe ya?
13Onye umengwụ na-asị, “Ọdụm nọ nʼokporoụzọ,
14Dịka ibo ọnụ ụzọ si emegharị nʼihe nkonye ya,
15Onye umengwụ na-amanye aka nʼefere nri26:15 Maọbụ, ọkụ nri
16Nʼuche ya, onye umengwụ26:16 Ya bụ, onye nzuzu na-eche na ọ maara ihe
17Onye na-etinye onwe ya nʼesemokwu na-agbasaghị ya
18Dịka onye ara na-agba àkụ
19ka nwoke ahụ bụ nke na-aghọgbu onye agbataobi ya
20Ọkụ na-anyụ mgbe nkụ gwụrụ,
21Dịka icheku si eme ka nkụ nwuru ọkụ,
22Okwu niile nke onye na-agba asịrị na-ekwu dịka iberibe nri nʼatọ ezi ụtọ,
23Dịka ite aja ụrọ nke e ji ọlaọcha na-abaghị uru techie,
24Ndị iro na-eji egbugbere ọnụ ha gbanwee onwe ha,
25Okwu ọnụ ya nwere ike tọọ ụtọ na ntị ma ekwenyerela ha,
26Ọ bụ ezie na ọ ga na-eme ka ọ hụrụ gị nʼanya,
27Onye na-egwuru ibe ya olulu ga-adaba nʼime ya.
28Onye ị kpọrọ asị bụ onye ị ga-achọ iwetara ihe mgbu site nʼịgha ụgha.