1Ekwosola ndị ajọ omume ekworo,
2Nʼihi na-atụmatụ obi ha niile bụ otu ha ga-esi mee ihe ike,
3Ọ bụ amamihe ka e ji ewu ụlọ,
4Sitekwa nʼihe ọmụma ka akụ niile ji ejupụta nʼime ya,
5Onye maara ihe na-emeri site nʼịdị ike,
6Ejela ọgụ ma ọ bụghị na i nwetara ezi ndụmọdụ,
7Amamihe dị elu nke ukwuu nye ndị nzuzu,
8Onye na-eche echiche ime ihe ọjọọ
9Nzube niile nke onye na-enweghị uche bụ mmehie,
10Ọ bụrụ na ị pụghị iguzosi ike nʼoge nsogbu,
11Napụta ndị a na-eduba nʼọnwụ.
12Ọ bụrụ na ị sị, “Anyị amaghị banyere ihe ndị a,”
13Nwa m nwoke, rachaa mmanụ aṅụ nʼihi na ọ dị mma.
14Marakwa na otu a ka amamihe kwesiri isi tọọ obi gị ụtọ.
15Adịla ka onye na-emebi iwu, onye echiche ya niile bụ imegide ụlọ onye ezi omume.
16Nʼihi na onye ezi omume nwere ike daa ugboro asaa ma o ga-ebilikwa ọzọ.
17Aṅụrịla ọṅụ mgbe onye iro gị dabara na nsogbu.
18Nʼihi na Onyenwe anyị pụrụ iwe iwe nʼihi ya
19Ekwosola onye na-emebi iwu ekworo,
20Nʼihi na onye na-emebi iwu enweghị ọdịnihu;
21Nwa m, tụọ egwu Onyenwe anyị na onye bụ eze,
22Nʼihi na ọ bụ na mberede ka ị ga-eso ha daba na nhụju anya.
23Ndị a bụkwa okwu ọzọ ndị amamihe kwuru,
24Onye ọbụla nke na-asị onye ikpe mara, “Onye ezi omume ka ị bụ,”24:24 Onye ọbụla nke na-asị onye na-emebi iwu, onye ikpe na-amaghị ka ị bụ
25Ma ọ ga-adịrị ndị ahụ na-abara onye ikpe mara mba na mma,
26Ọsịsa ziri ezi
27Rụchaa ọrụ gị dị nʼezi.
28Agbala ama ụgha megide onye agbataobi gị nʼefu.
29Asịla, “Aga m emeso ha dịka ha siri meso m.
30Esitere m nʼubi otu onye umengwụ gafee,
31hụ na ogwu etochiela ya,
32Elegharịrị m ya anya
33Nwa ụra nta, nwa iru ụra nta,
34ụbịam ga-abịakwasị gị dịka onye ohi,