1Iyi dị iche iche nke jupụtara na mmiri ka obi eze bụ nʼaka Onyenwe anyị,
2Ọrụ niile bụ ihe ziri ezi nʼanya onye na-arụ ya,
3Ime ezi omume na ihe ziri ezi
4Nganga na mpako na agụụ ihe ọjọọ
5Echiche niile nke onye na-arụsị ọrụ ike na-eweta uru,
6Uru niile enwetara nʼụzọ na-ezighị ezi adịghị adịgide,
7Nʼihi na ndị na-emebi iwu anaghị eme ihe ọma,
8Ụzọ onye na-emebi iwu bụ ihe gbagọrọ agbagọ,
9Ọ ka mma ibi nʼotu akụkụ elu ụlọ
10Ihe na-atọ onye ọjọọ ụtọ bụ imerụ ndị ọzọ ahụ;
11Mgbe a na-ata onye na-akwa emo ahụhụ, onye na-enweghị uche na-enweta amamihe,
12Onye ezi omume na-amụta ihe site nʼile ụlọ onye ajọ omume anya
13Onye na-adịghị ege ntị na mkpu onye ogbenye,
14Onyinye enyere na nzuzo na-eme ka iwe dajụọ,
15Onye ezi omume na-aṅụrị ọṅụ mgbe e kpere ikpe ziri ezi,
16Onye ọbụla si nʼụzọ nghọta wezuga onwe ya
17Nwoke hụrụ ibi ndụ nganga nʼanya na-ada ụkpa;
18Onye ajọ omume ga-abụ ihe mgbapụta maka onye ezi omume,
19Ọ ka mma ibi nʼọzara
20Onye maara ihe na-edebe ezi ihe oriri na mmanụ oliv nʼụlọ ya,
21Onye na-achụso ezi omume na ịhụnanya
22Onye maara ihe nwere ike megide obodo ndị dike,
23Onye na-echekwa ire ya na ọnụ ya
24Onye nganga na onye mpako, onye na-akwa emo bụ aha ya.
25Oke ọchịchọ nke onye umengwụ na-ewetara ya ọnwụ
26Kwa ụbọchị ka ọ na-achọ inwe karịa,
27Chineke kpọrọ aja ndị na-emebi iwu asị,
28Onyeama ụgha ga-ala nʼiyi,
29Ndị ajọ omume na-ebi ndụ atụghị egwu,
30O nweghị amamihe dị, o nweghị nghọta dị, o nwekwaghị atụmatụ ọbụla,
31E nwere ike jikere ịnyịnya, kwadokwaa maka agha,