1Nwa maara ihe na-ege ntị na ndụmọdụ nna ya
2Onye na-eme ezi ihe ga-esite nʼokwu ọnụ ya nweta ụgwọ ọrụ,
3Mmadụ zuruoke bụ onye na-ejide ire ya aka!13:3 Abụ 141:3; Ilu 21:23
4Ndị umengwụ na-achọ ọtụtụ ihe ma ọ dịghị ihe ha na-enweta;
5Onye ezi omume kpọrọ ụgha asị,
6Ezi omume mmadụ na-abara ya uru na ndụ ya niile,
7Ọ dị mmadụ na-eme ka ọ bụ ọgaranya maọbụ onye ụkpa.
8Ọgaranya nwere ike jiri ego ya gbapụta onwe ya,
9Ìhè onye ezi omume na-enwupụ enwupụ,
10Nganga na-eweta esemokwu,
11Akụ a kpatara ngwangwa na-emebikwa ngwangwa;
12Nchere a na-echere ogologo oge maka imezu olileanya e nwere na-egbu obi,
13Onye na-elelị ntụziaka anya ga-akwụ ụgwọ nʼihi ya,
14Nkuzi nke onye maara ihe bụ isi iyi nke ndụ,
15Ezi nghọta na-eweta ihuọma,
16Onye nwere uche na-eji ọmụma ihe nʼarụ ọrụ,
17Onyeozi ajọ omume na-adaba na nsogbu,
18Onye na-ajụ ịdọ aka na ntị ga-anwụ nʼụkpa na nʼihere;
19Mgbe ihe a na-ele anya mezuru ọ na-atọ mkpụrụobi ụtọ,
20Na-eso ndị maara ihe ka ị ghọọ onye mara ihe,
21Nsogbu bụ ihe na-esogharị ndị mmehie,
22Mgbe ezi mmadụ nwụrụ, ọ na-ahapụrụ ụmụ ya na ụmụ ụmụ ya akụ,
23Ubi onye ogbenye pụrụ inwe ọtụtụ ihe oriri,
24Onye ọbụla na-adọghị ụmụ ya aka na ntị, na-egosi na ọ hụghị ha nʼanya;
25Onye ezi omume na-eri nri ruo na nriju afọ onwe ya,